Maka Ndupu Johnspencer (Onye Nze)steemCreated with Sketch.

in #uri4 years ago

Ekpere na ọsịsa ya1


Okwu mmawụ (mmụọ) mmadụ hụrụ bụkwa

nke mmụọ ji ntị nụrụ
Igbo wụ okwukwe, mere e ji ekwu ya n'ọnụ
Ndupu, onye nze ji ọnụ gbatara m ozi ekele
were mee mụ mma, were aha m denye n'aha
ndị mere ihe edemede n'elu ogwe anya
n'ihu ọha dum.
Merenụ m ji na-ajụ:

Okwu m ọ ka nke gị? Ọ wụkwa Igbo bụ

ndị mụrụ nze, mụọ ọ́zọ̄ ? Ọ wụkwa ha
sị na mgbe a mụrụ dike na mba ka a mụrụ
ibe ya?
Ube nwanne bụ ntị ka e ji anụ ya
merenụ ụkwụ ji gbata ọsọ enyemaka
Ihe ha ka enyị bụ ọnụ ka e ji akọ ya
Igbo wụkwa okwukwe, merenụ e ji ekwe
ya n'ishi, dịka nkwekọrịta akpara akpa


Ndupu, ure anyị agaghị agwụ taa

ọ gaghị agwụ echi, anya ka anyị ga-eji
rịọọ Chukwu ọdịmma rue n'ọgwụgwụ oge.
Yamezuoo - ka ndị nna anyị hụta udo na ndụ
ka ndị nne anyị hụta ọmụmụ na ọganihu dị
ụtọ; ka Igbo doziee ma meriee. Ka
anyi site n'ihe anyi dere na n'ihe onyinye
anyị di iche iche nweta akụ na ụba dị ịtụ-n'anya.
Ka ụmụ anyị tolite n'ebe dị ụtọ.
Ka obi anyị niile doo na ndụ.


Ọnwụ ga-emehere anyị ụzọ ruokwa na ndụ ọzọ.

Otua - Ndupu onye nze, ọjị abịala n'ụtụtụ.
Ọjị agọrọ-agọ, gọpụ anyaukwu, gọpụ aghụghụọ
Ka anyị loo ya, n̄ụrụ mmiri, tee nzu ya na ha so.
Sapụ ihu, jiri aka abụọ buliee ọfọ ndụ.
Ka nke anyị na-eme ziri ezi - reere anyị mgbe dum.
Isee !!!



1 A prayer and its answer ...

Coin Marketplace

STEEM 0.17
TRX 0.13
JST 0.027
BTC 59410.96
ETH 2658.99
USDT 1.00
SBD 2.43